Juel 3:19
Joel 3:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu, Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda, bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha.
Joel 3:19 in English
Joel 3:19 · Berean Standard Bible
Egypt will become desolate, and Edom a desert wasteland, because of the violence done to the people of Judah, in whose land they shed innocent blood.
Context
17“Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu
bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ.
Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ.
Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ. 18“Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị,
mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile;
mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru.
Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta
dee Ndagwurugwu Shitim. 19Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu,
Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe,
nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda,
bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha. 20Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.
A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile. 21Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha?
Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị.
Nʼihi na Onyenwe anyị bi na Zayọn.”
3:2 Ihe aha a pụtara bụ, onyenwe anyị na-ekpe ikpe
3:5 Maọbụ, ụlọ ukwu unu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.