Juel 3:12
Joel 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ka akpọlitekwa mba niile, mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe.
Joel 3:12 in English
Joel 3:12 · Berean Standard Bible
Let the nations be roused and advance to the Valley of Jehoshaphat, for there I will sit down to judge all the nations on every side.
Context
10Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha,
kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe.
Ka onye na-adịghị ike kwuo sị,
“Adị m ike!” 11Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile.
Zukọtaanụ nʼebe ahụ.
Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị! 12“Ka akpọlitekwa mba niile,
mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat,
nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ
ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe. 13Tinye mma iwe ihe ubi,
nʼihi na mkpụrụ ubi achaala.
Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị,
nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula,
ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke,
nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.” 14Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ!
Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ!
Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,
na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.