Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’ Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ.
Job 7:4 in English
Job 7:4 · Berean Standard Bible
When I lie down I think: ‘When will I get up?’ But the night drags on, and I toss and turn until dawn.
Context
2Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada,
maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya, 3otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya,
nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya. 4Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’
Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ. 5Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ;
anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya. 6“Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa,
ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.