Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya, nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya.

Job 7:3 in English

Job 7:3 · Berean Standard Bible

So I am allotted months of futility, and nights of misery are appointed me.

Context

1“Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba? Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ? 2Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada, maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya, 3otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya, nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya. 4Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’ Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ. 5Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ; anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.