Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ; anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.

Job 7:5 in English

Job 7:5 · Berean Standard Bible

My flesh is clothed with worms and encrusted with dirt; my skin is cracked and festering.

Context

3otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya, nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya. 4Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’ Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ. 5Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ; anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya. 6“Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa, ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla. 7O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume; anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.