Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa, ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.

Job 7:6 in English

Job 7:6 · Berean Standard Bible

My days are swifter than a weaver’s shuttle; they come to an end without hope.

Context

4Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’ Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ. 5Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ; anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya. 6“Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa, ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla. 7O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume; anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ. 8Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ; unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.