Job 34:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi, ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe.
Job 34:8 in English
Job 34:8 · Berean Standard Bible
He keeps company with evildoers and walks with wicked men.
Context
6Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha
ma a na-ahụta m dịka onye ụgha;
ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m
ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’ 7Olee nwoke dịka Job,
nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri? 8Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi,
ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe. 9Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya
na mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.’* 10“Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta.
Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume,
bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.