Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha ma a na-ahụta m dịka onye ụgha; ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’

Job 34:6 in English

Job 34:6 · Berean Standard Bible

Would I lie about my case? My wound is incurable, though I am without transgression.’

Context

4Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi; ka anyị nọkọta mụta ihe dị mma. 5“Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume, ma Chineke na-anapụ m ikpe ziri ezi. 6Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha ma a na-ahụta m dịka onye ụgha; ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’ 7Olee nwoke dịka Job, nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri? 8Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi, ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.