Job 34:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Olee nwoke dịka Job, nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri?
Job 34:7 in English
Job 34:7 · Berean Standard Bible
What man is like Job, who drinks up derision like water?
Context
5“Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume,
ma Chineke na-anapụ m ikpe ziri ezi. 6Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha
ma a na-ahụta m dịka onye ụgha;
ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m
ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’ 7Olee nwoke dịka Job,
nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri? 8Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi,
ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe. 9Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya
na mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.’*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.