Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta. Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume, bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi.

Job 34:10 in English

Job 34:10 · Berean Standard Bible

Therefore listen to me, O men of understanding. Far be it from God to do wrong, and from the Almighty to act unjustly.

Context

8Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi, ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe. 9Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya na mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.’* 10“Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta. Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume, bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi. 11Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị, ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri. 12Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi, na Onye pụrụ ime ihe niile ga-ekpe ikpe nʼezighị ezi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.