Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi, na Onye pụrụ ime ihe niile ga-ekpe ikpe nʼezighị ezi.

Job 34:12 in English

Job 34:12 · Berean Standard Bible

Indeed, it is true that God does not act wickedly, and the Almighty does not pervert justice.

Context

10“Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta. Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume, bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi. 11Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị, ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri. 12Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi, na Onye pụrụ ime ihe niile ga-ekpe ikpe nʼezighị ezi. 13Onye họpụtara ya ịchị ụwa? Onye mere ya onye nlekọta ụwa niile? 14Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya iweghachi mmụọ ya na nkuume ya,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.