Job 34:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya iweghachi mmụọ ya na nkuume ya,
Job 34:14 in English
Job 34:14 · Berean Standard Bible
If He were to set His heart to it and withdraw His Spirit and breath,
Context
12Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi,
na Onye pụrụ ime ihe niile ga-ekpe ikpe nʼezighị ezi. 13Onye họpụtara ya ịchị ụwa?
Onye mere ya onye nlekọta ụwa niile? 14Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya
iweghachi mmụọ ya na nkuume ya, 15mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi,
mmadụ niile ga-alaghachikwa nʼaja. 16“Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a;
gee ntị nʼokwu m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.