Job 12:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.
Job 12:5 in English
Job 12:5 · Berean Standard Bible
The one at ease scorns misfortune as the fate of those whose feet are slipping.
Context
3Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu;
abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ.
Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu? 4“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ,
nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za,
onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị! 5Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya
dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ. 6Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ;
ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo,
bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha. 7“Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị,
maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.