Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ; ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo, bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.

Job 12:6 in English

Job 12:6 · Berean Standard Bible

The tents of robbers are safe, and those who provoke God are secure— those who carry their god in their hands.*

Context

4“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ, nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za, onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị! 5Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ. 6Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ; ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo, bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha. 7“Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị, maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị. 8Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị, maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.