Job 12:4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ, nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za, onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!
Job 12:4 in English
Job 12:4 · Berean Standard Bible
I am a laughingstock to my friends, though I called on God, and He answered. The righteous and upright man is a laughingstock.
Context
2“Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe,
unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu. 3Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu;
abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ.
Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu? 4“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ,
nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za,
onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị! 5Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya
dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ. 6Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ;
ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo,
bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.