Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu; abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ. Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?

Job 12:3 in English

Job 12:3 · Berean Standard Bible

But I also have a mind; I am not inferior to you. Who does not know such things as these?

Context

1Mgbe ahụ, Job zara: 2“Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe, unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu. 3Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu; abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ. Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu? 4“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ, nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za, onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị! 5Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.