Jeremaya 6:4
Jeremiah 6:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Jikerenụ ibu agha megide ya! Bilienụ, ka anyị buso ha agha nʼehihie. Ma lee, anyanwụ ebidola ịda, onyinyo anyasị na-esetipụkwa onwe ya.
Jeremiah 6:4 in English
Jeremiah 6:4 · Berean Standard Bible
‘Prepare for battle against her; rise up, let us attack at noon. Woe to us, for the daylight is fading; the evening shadows grow long.
Context
2Aga m ebibi ada Zayọn,
onye mara ezi mma, na onye dịkwa pekepeke. 3Ndị na-azụ atụrụ ga-eduru igwe atụrụ bịa megide ya.
Ha ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ya.
Onye ọbụla nʼime ha ga-elekọtazi akụkụ ala nke o ketara anya nke ọma. 4“Jikerenụ ibu agha megide ya!
Bilienụ, ka anyị buso ha agha nʼehihie.
Ma lee, anyanwụ ebidola ịda,
onyinyo anyasị na-esetipụkwa onwe ya. 5Ya mere, bilienụ ka anyị buso ha agha, ọ bụladị nʼabalị!
Ka anyị bibie ebe ha niile e wusiri ike!” 6Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru,
“Gbutusienụ osisi niile,
wuonụ nkwasa ọgụ gburugburu Jerusalem.
A ghaghị ịta obodo a ahụhụ,
nʼihi na mmegbu jupụtara nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.