Jeremaya 6:3
Jeremiah 6:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị na-azụ atụrụ ga-eduru igwe atụrụ bịa megide ya. Ha ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ya. Onye ọbụla nʼime ha ga-elekọtazi akụkụ ala nke o ketara anya nke ọma.
Jeremiah 6:3 in English
Jeremiah 6:3 · Berean Standard Bible
Shepherds and their flocks will come against her; they will pitch their tents all around her, each tending his own portion:
Context
1“Gbalaganụ unu ụmụ Benjamin!
Sitenụ na Jerusalem gbapụ!
Gbuonụ opi ike na Tekoa!
Bulienụ ihe ngosi elu na Bet-Hakerem!
Nʼihi na lee, ihe ọjọọ si nʼakụkụ ugwu na-abịa,
e, mbibi dị ukwuu na-abịa. 2Aga m ebibi ada Zayọn,
onye mara ezi mma, na onye dịkwa pekepeke. 3Ndị na-azụ atụrụ ga-eduru igwe atụrụ bịa megide ya.
Ha ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ya.
Onye ọbụla nʼime ha ga-elekọtazi akụkụ ala nke o ketara anya nke ọma. 4“Jikerenụ ibu agha megide ya!
Bilienụ, ka anyị buso ha agha nʼehihie.
Ma lee, anyanwụ ebidola ịda,
onyinyo anyasị na-esetipụkwa onwe ya. 5Ya mere, bilienụ ka anyị buso ha agha, ọ bụladị nʼabalị!
Ka anyị bibie ebe ha niile e wusiri ike!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.