Native Bible

Jeremiah 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, bilienụ ka anyị buso ha agha, ọ bụladị nʼabalị! Ka anyị bibie ebe ha niile e wusiri ike!”

Jeremiah 6:5 in English

Jeremiah 6:5 · Berean Standard Bible

Rise up, let us attack by night and destroy her fortresses!’”

Context

3Ndị na-azụ atụrụ ga-eduru igwe atụrụ bịa megide ya. Ha ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ya. Onye ọbụla nʼime ha ga-elekọtazi akụkụ ala nke o ketara anya nke ọma. 4“Jikerenụ ibu agha megide ya! Bilienụ, ka anyị buso ha agha nʼehihie. Ma lee, anyanwụ ebidola ịda, onyinyo anyasị na-esetipụkwa onwe ya. 5Ya mere, bilienụ ka anyị buso ha agha, ọ bụladị nʼabalị! Ka anyị bibie ebe ha niile e wusiri ike!” 6Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru, “Gbutusienụ osisi niile, wuonụ nkwasa ọgụ gburugburu Jerusalem. A ghaghị ịta obodo a ahụhụ, nʼihi na mmegbu jupụtara nʼime ya. 7Dịka mmiri si esite nʼolulu mmiri na-asọpụta otu a ka ajọ omume na-esite nʼime ya na-asọpụta. Ihe ike na mbibi ka a na-anụ nʼime ya; ọrịa ya niile na ọnya ya niile ka a na-eche nʼihu m oge niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.