Jeremaya 6:5
Jeremiah 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, bilienụ ka anyị buso ha agha, ọ bụladị nʼabalị! Ka anyị bibie ebe ha niile e wusiri ike!”
Jeremiah 6:5 in English
Jeremiah 6:5 · Berean Standard Bible
Rise up, let us attack by night and destroy her fortresses!’”
Context
3Ndị na-azụ atụrụ ga-eduru igwe atụrụ bịa megide ya.
Ha ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ya.
Onye ọbụla nʼime ha ga-elekọtazi akụkụ ala nke o ketara anya nke ọma. 4“Jikerenụ ibu agha megide ya!
Bilienụ, ka anyị buso ha agha nʼehihie.
Ma lee, anyanwụ ebidola ịda,
onyinyo anyasị na-esetipụkwa onwe ya. 5Ya mere, bilienụ ka anyị buso ha agha, ọ bụladị nʼabalị!
Ka anyị bibie ebe ha niile e wusiri ike!” 6Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru,
“Gbutusienụ osisi niile,
wuonụ nkwasa ọgụ gburugburu Jerusalem.
A ghaghị ịta obodo a ahụhụ,
nʼihi na mmegbu jupụtara nʼime ya. 7Dịka mmiri si esite nʼolulu mmiri na-asọpụta
otu a ka ajọ omume na-esite nʼime ya na-asọpụta.
Ihe ike na mbibi ka a na-anụ nʼime ya;
ọrịa ya niile na ọnya ya niile ka a na-eche nʼihu m oge niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.