Jeremaya 6:7
Jeremiah 6:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka mmiri si esite nʼolulu mmiri na-asọpụta otu a ka ajọ omume na-esite nʼime ya na-asọpụta. Ihe ike na mbibi ka a na-anụ nʼime ya; ọrịa ya niile na ọnya ya niile ka a na-eche nʼihu m oge niile.
Jeremiah 6:7 in English
Jeremiah 6:7 · Berean Standard Bible
As a well gushes its water, so she pours out her evil. Violence and destruction resound in her; sickness and wounds are ever before Me.
Context
5Ya mere, bilienụ ka anyị buso ha agha, ọ bụladị nʼabalị!
Ka anyị bibie ebe ha niile e wusiri ike!” 6Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru,
“Gbutusienụ osisi niile,
wuonụ nkwasa ọgụ gburugburu Jerusalem.
A ghaghị ịta obodo a ahụhụ,
nʼihi na mmegbu jupụtara nʼime ya. 7Dịka mmiri si esite nʼolulu mmiri na-asọpụta
otu a ka ajọ omume na-esite nʼime ya na-asọpụta.
Ihe ike na mbibi ka a na-anụ nʼime ya;
ọrịa ya niile na ọnya ya niile ka a na-eche nʼihu m oge niile. 8Nabata ịdọ aka na ntị m, gị Jerusalem,
ka m ghara ịgbakụta gị azụ,
mee ka ala gị tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla hapụkwa inwe ike ibi nʼime ya.” 9Nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Ka ha tụtụkọtasịa ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel nke ọma,
dịka e si atụtụkọta mkpụrụ niile dị nʼosisi vaịnị;
werenụ aka chọgharịa nʼalaka niile,
dịka onye ọghọ mkpụrụ vaịnị si eme.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.