Jeremaya 6:8
Jeremiah 6:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nabata ịdọ aka na ntị m, gị Jerusalem, ka m ghara ịgbakụta gị azụ, mee ka ala gị tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụkwa inwe ike ibi nʼime ya.”
Jeremiah 6:8 in English
Jeremiah 6:8 · Berean Standard Bible
Be forewarned, O Jerusalem, or I will turn away from you; I will make you a desolation, a land without inhabitant.”
Context
6Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru,
“Gbutusienụ osisi niile,
wuonụ nkwasa ọgụ gburugburu Jerusalem.
A ghaghị ịta obodo a ahụhụ,
nʼihi na mmegbu jupụtara nʼime ya. 7Dịka mmiri si esite nʼolulu mmiri na-asọpụta
otu a ka ajọ omume na-esite nʼime ya na-asọpụta.
Ihe ike na mbibi ka a na-anụ nʼime ya;
ọrịa ya niile na ọnya ya niile ka a na-eche nʼihu m oge niile. 8Nabata ịdọ aka na ntị m, gị Jerusalem,
ka m ghara ịgbakụta gị azụ,
mee ka ala gị tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla hapụkwa inwe ike ibi nʼime ya.” 9Nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Ka ha tụtụkọtasịa ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel nke ọma,
dịka e si atụtụkọta mkpụrụ niile dị nʼosisi vaịnị;
werenụ aka chọgharịa nʼalaka niile,
dịka onye ọghọ mkpụrụ vaịnị si eme.” 10Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị?
Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu?
Ntị ha emechiela
ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla.
Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ;
nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.