Native Bible

Jeremiah 6:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị? Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu? Ntị ha emechiela ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla. Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ; nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ.

Jeremiah 6:10 in English

Jeremiah 6:10 · Berean Standard Bible

To whom can I give this warning? Who will listen to me? Look, their ears are closed,* so they cannot hear. See, the word of the LORD has become offensive to them; they find no pleasure in it.

Context

8Nabata ịdọ aka na ntị m, gị Jerusalem, ka m ghara ịgbakụta gị azụ, mee ka ala gị tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụkwa inwe ike ibi nʼime ya.” 9Nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ka ha tụtụkọtasịa ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel nke ọma, dịka e si atụtụkọta mkpụrụ niile dị nʼosisi vaịnị; werenụ aka chọgharịa nʼalaka niile, dịka onye ọghọ mkpụrụ vaịnị si eme.” 10Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị? Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu? Ntị ha emechiela ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla. Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ; nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ. 11Ma ọnụma Onyenwe anyị juru m obi, apụghị m ịnagide ya nʼime m. “Wụkwasị ya nʼahụ ụmụntakịrị ndị nọ nʼokporoụzọ; wụkwasịkwa ya ụmụ okorobịa ebe ha zukọrọ. Ọ bụladị di na nwunye ga-anụrụ ụfụ ọnụma ahụ, ndị agadi na ndị ahụ merela nnọọ ezigbo agadi. 12A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ. A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ, *mgbe m setịpụrụ aka m megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.