Jeremaya 6:10
Jeremiah 6:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị? Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu? Ntị ha emechiela ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla. Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ; nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ.
Jeremiah 6:10 in English
Jeremiah 6:10 · Berean Standard Bible
To whom can I give this warning? Who will listen to me? Look, their ears are closed,* so they cannot hear. See, the word of the LORD has become offensive to them; they find no pleasure in it.
Context
8Nabata ịdọ aka na ntị m, gị Jerusalem,
ka m ghara ịgbakụta gị azụ,
mee ka ala gị tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla hapụkwa inwe ike ibi nʼime ya.” 9Nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Ka ha tụtụkọtasịa ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel nke ọma,
dịka e si atụtụkọta mkpụrụ niile dị nʼosisi vaịnị;
werenụ aka chọgharịa nʼalaka niile,
dịka onye ọghọ mkpụrụ vaịnị si eme.” 10Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị?
Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu?
Ntị ha emechiela
ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla.
Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ;
nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ. 11Ma ọnụma Onyenwe anyị juru m obi,
apụghị m ịnagide ya nʼime m.
“Wụkwasị ya nʼahụ ụmụntakịrị ndị nọ nʼokporoụzọ;
wụkwasịkwa ya ụmụ okorobịa ebe ha zukọrọ.
Ọ bụladị di na nwunye ga-anụrụ ụfụ ọnụma ahụ,
ndị agadi na ndị ahụ merela nnọọ ezigbo agadi. 12A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ.
A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ,
*mgbe m setịpụrụ aka m
megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.