Jeremaya 6:11
Jeremiah 6:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọnụma Onyenwe anyị juru m obi, apụghị m ịnagide ya nʼime m. “Wụkwasị ya nʼahụ ụmụntakịrị ndị nọ nʼokporoụzọ; wụkwasịkwa ya ụmụ okorobịa ebe ha zukọrọ. Ọ bụladị di na nwunye ga-anụrụ ụfụ ọnụma ahụ, ndị agadi na ndị ahụ merela nnọọ ezigbo agadi.
Jeremiah 6:11 in English
Jeremiah 6:11 · Berean Standard Bible
But I am full of the LORD’s wrath; I am tired of holding it back. “Pour it out on the children in the street, and on the young men gathered together. For both husband and wife will be captured, the old and the very old alike.
Context
9Nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Ka ha tụtụkọtasịa ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel nke ọma,
dịka e si atụtụkọta mkpụrụ niile dị nʼosisi vaịnị;
werenụ aka chọgharịa nʼalaka niile,
dịka onye ọghọ mkpụrụ vaịnị si eme.” 10Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị?
Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu?
Ntị ha emechiela
ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla.
Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ;
nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ. 11Ma ọnụma Onyenwe anyị juru m obi,
apụghị m ịnagide ya nʼime m.
“Wụkwasị ya nʼahụ ụmụntakịrị ndị nọ nʼokporoụzọ;
wụkwasịkwa ya ụmụ okorobịa ebe ha zukọrọ.
Ọ bụladị di na nwunye ga-anụrụ ụfụ ọnụma ahụ,
ndị agadi na ndị ahụ merela nnọọ ezigbo agadi. 12A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ.
A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ,
*mgbe m setịpụrụ aka m
megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 13“Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta,
ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha.
Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja
na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.