Jeremaya 6:13
Jeremiah 6:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.
Jeremiah 6:13 in English
Jeremiah 6:13 · Berean Standard Bible
“For from the least of them to the greatest, all are greedy for gain; from prophet to priest, all practice deceit.
Context
11Ma ọnụma Onyenwe anyị juru m obi,
apụghị m ịnagide ya nʼime m.
“Wụkwasị ya nʼahụ ụmụntakịrị ndị nọ nʼokporoụzọ;
wụkwasịkwa ya ụmụ okorobịa ebe ha zukọrọ.
Ọ bụladị di na nwunye ga-anụrụ ụfụ ọnụma ahụ,
ndị agadi na ndị ahụ merela nnọọ ezigbo agadi. 12A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ.
A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ,
*mgbe m setịpụrụ aka m
megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 13“Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta,
ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha.
Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja
na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ. 14Ha na-ekechi ọnya ndị m,
dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ.
Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’
mgbe udo na-adịghị. 15O nwere ụzọ omume ha ndị a rụrụ arụ si eme ha ihere?
Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị.
Nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere!
Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada.
Ha ga-asọ ngọngọ mgbe m tara ha ahụhụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.