Native Bible

Jeremiah 6:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha na-ekechi ọnya ndị m, dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’ mgbe udo na-adịghị.

Jeremiah 6:14 in English

Jeremiah 6:14 · Berean Standard Bible

They dress the wound of My people with very little care, saying, ‘Peace, peace,’ when there is no peace at all.

Context

12A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ. A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ, *mgbe m setịpụrụ aka m megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 13“Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ. 14Ha na-ekechi ọnya ndị m, dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’ mgbe udo na-adịghị. 15O nwere ụzọ omume ha ndị a rụrụ arụ si eme ha ihere? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị. Nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere! Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada. Ha ga-asọ ngọngọ mgbe m tara ha ahụhụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 16Ihe ndị a kwa bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Guzonụ nʼebe niile ụzọ gbara abụọ. Lee anya. Jụọnụ ajụjụ banyere okporoụzọ ochie ahụ. Jụpụtanụ ebe ụzọ ọma ahụ dị, jeenụ ije nʼime ya. Unu gbaso ya, unu ga-achọtara mkpụrụobi unu ebe izuike. Ma gịnị ka unu kwuru? Unu sịrị. ‘Anyị agaghị agbaso ụzọ ọma ahụ.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.