Jeremaya 6:16
Jeremiah 6:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a kwa bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Guzonụ nʼebe niile ụzọ gbara abụọ. Lee anya. Jụọnụ ajụjụ banyere okporoụzọ ochie ahụ. Jụpụtanụ ebe ụzọ ọma ahụ dị, jeenụ ije nʼime ya. Unu gbaso ya, unu ga-achọtara mkpụrụobi unu ebe izuike. Ma gịnị ka unu kwuru? Unu sịrị. ‘Anyị agaghị agbaso ụzọ ọma ahụ.’
Jeremiah 6:16 in English
Jeremiah 6:16 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “Stand at the crossroads and look. Ask for the ancient paths: ‘Where is the good way?’ Then walk in it, and you will find rest for your souls. But they said, ‘We will not walk in it!’
Context
14Ha na-ekechi ọnya ndị m,
dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ.
Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’
mgbe udo na-adịghị. 15O nwere ụzọ omume ha ndị a rụrụ arụ si eme ha ihere?
Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị.
Nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere!
Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada.
Ha ga-asọ ngọngọ mgbe m tara ha ahụhụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 16Ihe ndị a kwa bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
“Guzonụ nʼebe niile ụzọ gbara abụọ. Lee anya.
Jụọnụ ajụjụ banyere okporoụzọ ochie ahụ.
Jụpụtanụ ebe ụzọ ọma ahụ dị, jeenụ ije nʼime ya.
Unu gbaso ya, unu ga-achọtara mkpụrụobi unu ebe izuike.
Ma gịnị ka unu kwuru? Unu sịrị. ‘Anyị agaghị agbaso ụzọ ọma ahụ.’ 17Ahọpụtara m ndị nche doo ha ichebe unu. Agwakwara m unu okwu sị,
‘Ṅaanụ ntị nʼụda opi ike ha.’
Ma unu kwuru sị, ‘Anyị agaghị ege ntị!’ 18Ya mere, nụrụnụ, unu mba niile;
lezienụ anya, unu ndị akaebe niile,
ka unu hụrụ ihe na-aga ịbịakwasị ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.