Native Bible

Jeremiah 6:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ahọpụtara m ndị nche doo ha ichebe unu. Agwakwara m unu okwu sị, ‘Ṅaanụ ntị nʼụda opi ike ha.’ Ma unu kwuru sị, ‘Anyị agaghị ege ntị!’

Jeremiah 6:17 in English

Jeremiah 6:17 · Berean Standard Bible

I appointed watchmen over you and said, ‘Listen for the sound of the ram’s horn.’ But they answered, ‘We will not listen!’

Context

15O nwere ụzọ omume ha ndị a rụrụ arụ si eme ha ihere? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị. Nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere! Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada. Ha ga-asọ ngọngọ mgbe m tara ha ahụhụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 16Ihe ndị a kwa bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Guzonụ nʼebe niile ụzọ gbara abụọ. Lee anya. Jụọnụ ajụjụ banyere okporoụzọ ochie ahụ. Jụpụtanụ ebe ụzọ ọma ahụ dị, jeenụ ije nʼime ya. Unu gbaso ya, unu ga-achọtara mkpụrụobi unu ebe izuike. Ma gịnị ka unu kwuru? Unu sịrị. ‘Anyị agaghị agbaso ụzọ ọma ahụ.’ 17Ahọpụtara m ndị nche doo ha ichebe unu. Agwakwara m unu okwu sị, ‘Ṅaanụ ntị nʼụda opi ike ha.’ Ma unu kwuru sị, ‘Anyị agaghị ege ntị!’ 18Ya mere, nụrụnụ, unu mba niile; lezienụ anya, unu ndị akaebe niile, ka unu hụrụ ihe na-aga ịbịakwasị ha. 19Nụrụ, gị ụwa, lee, ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi, nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile, nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.