Jeremaya 6:19
Jeremiah 6:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nụrụ, gị ụwa, lee, ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi, nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile, nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m.
Jeremiah 6:19 in English
Jeremiah 6:19 · Berean Standard Bible
Hear, O earth! I am bringing disaster on this people, the fruit of their own schemes, because they have paid no attention to My word and have rejected My instruction.
Context
17Ahọpụtara m ndị nche doo ha ichebe unu. Agwakwara m unu okwu sị,
‘Ṅaanụ ntị nʼụda opi ike ha.’
Ma unu kwuru sị, ‘Anyị agaghị ege ntị!’ 18Ya mere, nụrụnụ, unu mba niile;
lezienụ anya, unu ndị akaebe niile,
ka unu hụrụ ihe na-aga ịbịakwasị ha. 19Nụrụ, gị ụwa, lee,
ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi,
nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile,
nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m.
Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m. 20Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke unu si nʼobodo Sheba bubata, eme?
Gịnị ka m ji ụda kalamus ọma unu si mba dị anya bubata eme?
Ajụla m ịnabata aja nsure ọkụ unu niile.
Aja niile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.” 21Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
“Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe.
Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya;
otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.