Jeremaya 6:20
Jeremiah 6:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke unu si nʼobodo Sheba bubata, eme? Gịnị ka m ji ụda kalamus ọma unu si mba dị anya bubata eme? Ajụla m ịnabata aja nsure ọkụ unu niile. Aja niile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.”
Jeremiah 6:20 in English
Jeremiah 6:20 · Berean Standard Bible
What use to Me is frankincense from Sheba or sweet cane from a distant land? Your burnt offerings are not acceptable; your sacrifices do not please Me.”
Context
18Ya mere, nụrụnụ, unu mba niile;
lezienụ anya, unu ndị akaebe niile,
ka unu hụrụ ihe na-aga ịbịakwasị ha. 19Nụrụ, gị ụwa, lee,
ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi,
nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile,
nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m.
Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m. 20Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke unu si nʼobodo Sheba bubata, eme?
Gịnị ka m ji ụda kalamus ọma unu si mba dị anya bubata eme?
Ajụla m ịnabata aja nsure ọkụ unu niile.
Aja niile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.” 21Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
“Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe.
Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya;
otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.” 22Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, ndị agha si nʼala
dị nʼebe ugwu na-abịa;
mba dị ukwuu ka a na-akpọlitekwa
site na nsọtụ niile nke ụwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.