Native Bible

Jeremiah 6:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke unu si nʼobodo Sheba bubata, eme? Gịnị ka m ji ụda kalamus ọma unu si mba dị anya bubata eme? Ajụla m ịnabata aja nsure ọkụ unu niile. Aja niile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.”

Jeremiah 6:20 in English

Jeremiah 6:20 · Berean Standard Bible

What use to Me is frankincense from Sheba or sweet cane from a distant land? Your burnt offerings are not acceptable; your sacrifices do not please Me.”

Context

18Ya mere, nụrụnụ, unu mba niile; lezienụ anya, unu ndị akaebe niile, ka unu hụrụ ihe na-aga ịbịakwasị ha. 19Nụrụ, gị ụwa, lee, ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi, nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile, nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m. 20Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke unu si nʼobodo Sheba bubata, eme? Gịnị ka m ji ụda kalamus ọma unu si mba dị anya bubata eme? Ajụla m ịnabata aja nsure ọkụ unu niile. Aja niile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.” 21Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe. Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya; otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.” 22Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa; mba dị ukwuu ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.