Jeremaya 6:21
Jeremiah 6:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe. Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya; otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.”
Jeremiah 6:21 in English
Jeremiah 6:21 · Berean Standard Bible
Therefore this is what the LORD says: “I will lay stumbling blocks before this people; fathers and sons alike will be staggered; friends and neighbors will perish.”
Context
19Nụrụ, gị ụwa, lee,
ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi,
nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile,
nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m.
Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m. 20Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke unu si nʼobodo Sheba bubata, eme?
Gịnị ka m ji ụda kalamus ọma unu si mba dị anya bubata eme?
Ajụla m ịnabata aja nsure ọkụ unu niile.
Aja niile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.” 21Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
“Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe.
Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya;
otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.” 22Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, ndị agha si nʼala
dị nʼebe ugwu na-abịa;
mba dị ukwuu ka a na-akpọlitekwa
site na nsọtụ niile nke ụwa. 23Ha ji ụta na ùbe,
ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-adịghị eme obi ebere.
Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri,
dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha.
Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha,
ibuso gị agha, Ada Zayọn.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.