Jeremaya 6:23
Jeremiah 6:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ji ụta na ùbe, ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-adịghị eme obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Zayọn.”
Jeremiah 6:23 in English
Jeremiah 6:23 · Berean Standard Bible
They grasp the bow and spear;* they are cruel and merciless. Their voice roars like the sea, and they ride upon horses, lined up like men in formation against you, O Daughter of Zion.”
Context
21Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
“Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe.
Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya;
otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.” 22Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, ndị agha si nʼala
dị nʼebe ugwu na-abịa;
mba dị ukwuu ka a na-akpọlitekwa
site na nsọtụ niile nke ụwa. 23Ha ji ụta na ùbe,
ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-adịghị eme obi ebere.
Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri,
dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha.
Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha,
ibuso gị agha, Ada Zayọn.” 24Anyị anụla akụkọ banyere ude ha,
ike agwụla aka anyị* abụọ kpamkpam.
Oke ihe mgbu na-ejide anyị
dị ka nke nwanyị ime na-eme. 25Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi,
maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ,
nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị,
egwu dịkwa nʼebe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.