Jeremaya 6:24
Jeremiah 6:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị anụla akụkọ banyere ude ha, ike agwụla aka anyị* abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu na-ejide anyị dị ka nke nwanyị ime na-eme.
Jeremiah 6:24 in English
Jeremiah 6:24 · Berean Standard Bible
We have heard the report; our hands hang limp. Anguish has gripped us, pain like that of a woman in labor.
Context
22Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, ndị agha si nʼala
dị nʼebe ugwu na-abịa;
mba dị ukwuu ka a na-akpọlitekwa
site na nsọtụ niile nke ụwa. 23Ha ji ụta na ùbe,
ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-adịghị eme obi ebere.
Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri,
dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha.
Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha,
ibuso gị agha, Ada Zayọn.” 24Anyị anụla akụkọ banyere ude ha,
ike agwụla aka anyị* abụọ kpamkpam.
Oke ihe mgbu na-ejide anyị
dị ka nke nwanyị ime na-eme. 25Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi,
maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ,
nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị,
egwu dịkwa nʼebe niile. 26Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe.
Tụrụọnụ onwe unu na ntụ,
ruonụ uju, ma kwaanụ akwa,
dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara.
Nʼihi na onye mbibi ahụ
ga-abịakwasị anyị na mberede.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.