Jeremaya 6:25
Jeremiah 6:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi, maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ, nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị, egwu dịkwa nʼebe niile.
Jeremiah 6:25 in English
Jeremiah 6:25 · Berean Standard Bible
Do not go out to the fields; do not walk the road. For the enemy has a sword; terror is on every side.
Context
23Ha ji ụta na ùbe,
ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-adịghị eme obi ebere.
Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri,
dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha.
Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha,
ibuso gị agha, Ada Zayọn.” 24Anyị anụla akụkọ banyere ude ha,
ike agwụla aka anyị* abụọ kpamkpam.
Oke ihe mgbu na-ejide anyị
dị ka nke nwanyị ime na-eme. 25Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi,
maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ,
nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị,
egwu dịkwa nʼebe niile. 26Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe.
Tụrụọnụ onwe unu na ntụ,
ruonụ uju, ma kwaanụ akwa,
dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara.
Nʼihi na onye mbibi ahụ
ga-abịakwasị anyị na mberede. 27“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla,
ma ọla ahụ bụkwa ndị m.
Achọrọ m ka i nyochaa
ma nwapụtakwa ụzọ ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.