Native Bible

Jeremiah 6:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla, ma ọla ahụ bụkwa ndị m. Achọrọ m ka i nyochaa ma nwapụtakwa ụzọ ha niile.

Jeremiah 6:27 in English

Jeremiah 6:27 · Berean Standard Bible

“I have appointed you to examine My people like ore,* so you may know and try their ways.

Context

25Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi, maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ, nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị, egwu dịkwa nʼebe niile. 26Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe. Tụrụọnụ onwe unu na ntụ, ruonụ uju, ma kwaanụ akwa, dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara. Nʼihi na onye mbibi ahụ ga-abịakwasị anyị na mberede. 27“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla, ma ọla ahụ bụkwa ndị m. Achọrọ m ka i nyochaa ma nwapụtakwa ụzọ ha niile. 28Ha bụ ndị nnupu isi, ndị nwere obi nʼazụ, ndị na-ejegharị na-ekwutọ ibe ha. Ha bụ bronz na igwe; ọ bụkwa ndụ rụrụ arụ ka ha na-ebi. 29Ngwa ọrụ ọkpụ uzu na-afụnwu ọkụ ike ike, ime ka ọkụ rechapụ akụkụ igwe ahụ na-enweghị isi, ma nnụcha ahụ na-aga nʼihu abaghị uru, nʼihi na anụchapụghị ndị ajọ omume.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.