Jeremaya 6:27
Jeremiah 6:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla, ma ọla ahụ bụkwa ndị m. Achọrọ m ka i nyochaa ma nwapụtakwa ụzọ ha niile.
Jeremiah 6:27 in English
Jeremiah 6:27 · Berean Standard Bible
“I have appointed you to examine My people like ore,* so you may know and try their ways.
Context
25Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi,
maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ,
nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị,
egwu dịkwa nʼebe niile. 26Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe.
Tụrụọnụ onwe unu na ntụ,
ruonụ uju, ma kwaanụ akwa,
dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara.
Nʼihi na onye mbibi ahụ
ga-abịakwasị anyị na mberede. 27“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla,
ma ọla ahụ bụkwa ndị m.
Achọrọ m ka i nyochaa
ma nwapụtakwa ụzọ ha niile. 28Ha bụ ndị nnupu isi, ndị nwere obi nʼazụ,
ndị na-ejegharị na-ekwutọ ibe ha.
Ha bụ bronz na igwe;
ọ bụkwa ndụ rụrụ arụ ka ha na-ebi. 29Ngwa ọrụ ọkpụ uzu na-afụnwu ọkụ ike ike,
ime ka ọkụ rechapụ akụkụ igwe ahụ na-enweghị isi,
ma nnụcha ahụ na-aga nʼihu abaghị uru,
nʼihi na anụchapụghị ndị ajọ omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.