Native Bible

Jeremiah 6:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha bụ ndị nnupu isi, ndị nwere obi nʼazụ, ndị na-ejegharị na-ekwutọ ibe ha. Ha bụ bronz na igwe; ọ bụkwa ndụ rụrụ arụ ka ha na-ebi.

Jeremiah 6:28 in English

Jeremiah 6:28 · Berean Standard Bible

All are hardened rebels, walking around as slanderers. They are bronze and iron; all of them are corrupt.

Context

26Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe. Tụrụọnụ onwe unu na ntụ, ruonụ uju, ma kwaanụ akwa, dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara. Nʼihi na onye mbibi ahụ ga-abịakwasị anyị na mberede. 27“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla, ma ọla ahụ bụkwa ndị m. Achọrọ m ka i nyochaa ma nwapụtakwa ụzọ ha niile. 28Ha bụ ndị nnupu isi, ndị nwere obi nʼazụ, ndị na-ejegharị na-ekwutọ ibe ha. Ha bụ bronz na igwe; ọ bụkwa ndụ rụrụ arụ ka ha na-ebi. 29Ngwa ọrụ ọkpụ uzu na-afụnwu ọkụ ike ike, ime ka ọkụ rechapụ akụkụ igwe ahụ na-enweghị isi, ma nnụcha ahụ na-aga nʼihu abaghị uru, nʼihi na anụchapụghị ndị ajọ omume. 30Ọlaọcha a jụrụ ajụ ka akpọrọ ha, nʼihi na Onyenwe anyị ajụla ha.” 6:12 Ee, ihe ndị a ga-emezu 6:24 Ya bụ, akụdawo

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.