Jeremaya 6:26
Jeremiah 6:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe. Tụrụọnụ onwe unu na ntụ, ruonụ uju, ma kwaanụ akwa, dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara. Nʼihi na onye mbibi ahụ ga-abịakwasị anyị na mberede.
Jeremiah 6:26 in English
Jeremiah 6:26 · Berean Standard Bible
O daughter of my people, dress yourselves in sackcloth and roll in ashes. Mourn with bitter wailing, as you would for an only son, for suddenly the destroyer will come upon us.
Context
24Anyị anụla akụkọ banyere ude ha,
ike agwụla aka anyị* abụọ kpamkpam.
Oke ihe mgbu na-ejide anyị
dị ka nke nwanyị ime na-eme. 25Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi,
maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ,
nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị,
egwu dịkwa nʼebe niile. 26Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe.
Tụrụọnụ onwe unu na ntụ,
ruonụ uju, ma kwaanụ akwa,
dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara.
Nʼihi na onye mbibi ahụ
ga-abịakwasị anyị na mberede. 27“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla,
ma ọla ahụ bụkwa ndị m.
Achọrọ m ka i nyochaa
ma nwapụtakwa ụzọ ha niile. 28Ha bụ ndị nnupu isi, ndị nwere obi nʼazụ,
ndị na-ejegharị na-ekwutọ ibe ha.
Ha bụ bronz na igwe;
ọ bụkwa ndụ rụrụ arụ ka ha na-ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.