Jeremaya 6:12
Jeremiah 6:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ. A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ, *mgbe m setịpụrụ aka m megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Jeremiah 6:12 in English
Jeremiah 6:12 · Berean Standard Bible
Their houses will be turned over to others, their fields and wives as well, for I will stretch out My hand against the inhabitants of the land,” declares the LORD.
Context
10Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị?
Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu?
Ntị ha emechiela
ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla.
Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ;
nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ. 11Ma ọnụma Onyenwe anyị juru m obi,
apụghị m ịnagide ya nʼime m.
“Wụkwasị ya nʼahụ ụmụntakịrị ndị nọ nʼokporoụzọ;
wụkwasịkwa ya ụmụ okorobịa ebe ha zukọrọ.
Ọ bụladị di na nwunye ga-anụrụ ụfụ ọnụma ahụ,
ndị agadi na ndị ahụ merela nnọọ ezigbo agadi. 12A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ.
A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ,
*mgbe m setịpụrụ aka m
megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 13“Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta,
ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha.
Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja
na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ. 14Ha na-ekechi ọnya ndị m,
dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ.
Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’
mgbe udo na-adịghị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.