Jeremaya 51:28
Jeremiah 51:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha, kwadoonụ ndị eze Midia, na ndị ha na-achị achị, na ndịisi ọchịchị, na mba niile nke ha na-achị.
Jeremiah 51:28 in English
Jeremiah 51:28 · Berean Standard Bible
Prepare the nations for battle against her— the kings of the Medes, their governors and all their officials, and all the lands they rule.
Context
26A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ,
maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla,
nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 27“Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ.
Fụọnụ opi ike nʼetiti mba niile.
Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ya;
kpọkuonụ alaeze ndị a niile imegide ya:
Ararat, na Mini, na Ashkenaz.
Họpụtanụ ọchịagha ga-edu usuu ndị agha megide ya;
ziganụ ịnyịnya ga-adị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka igurube. 28Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha,
kwadoonụ ndị eze Midia,
na ndị ha na-achị achị, na ndịisi ọchịchị,
na mba niile nke ha na-achị. 29Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu,
nʼihi na nzube Onyenwe anyị zubere megide Babilọn ga-emezu.
Ọ ga-eme ka ala Babilọn ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya. 30Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ;
ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike.
Ike agwụla ha;
ha adịla ka ndị inyom.
E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ,
tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.