Jeremaya 51:29
Jeremiah 51:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu, nʼihi na nzube Onyenwe anyị zubere megide Babilọn ga-emezu. Ọ ga-eme ka ala Babilọn ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya.
Jeremiah 51:29 in English
Jeremiah 51:29 · Berean Standard Bible
The earth quakes and writhes because the LORD’s intentions against Babylon stand: to make the land of Babylon a desolation, without inhabitant.
Context
27“Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ.
Fụọnụ opi ike nʼetiti mba niile.
Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ya;
kpọkuonụ alaeze ndị a niile imegide ya:
Ararat, na Mini, na Ashkenaz.
Họpụtanụ ọchịagha ga-edu usuu ndị agha megide ya;
ziganụ ịnyịnya ga-adị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka igurube. 28Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha,
kwadoonụ ndị eze Midia,
na ndị ha na-achị achị, na ndịisi ọchịchị,
na mba niile nke ha na-achị. 29Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu,
nʼihi na nzube Onyenwe anyị zubere megide Babilọn ga-emezu.
Ọ ga-eme ka ala Babilọn ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya. 30Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ;
ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike.
Ike agwụla ha;
ha adịla ka ndị inyom.
E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ,
tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile. 31Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya,
otu onyeozi na-esochikwa onyeozi ọzọ nʼazụ;
ha niile na-abịa izi eze Babilọn ozi sị ya
na a dọtala obodo ya nʼagha,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.