Native Bible

Jeremiah 51:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ. Fụọnụ opi ike nʼetiti mba niile. Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ya; kpọkuonụ alaeze ndị a niile imegide ya: Ararat, na Mini, na Ashkenaz. Họpụtanụ ọchịagha ga-edu usuu ndị agha megide ya; ziganụ ịnyịnya ga-adị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka igurube.

Jeremiah 51:27 in English

Jeremiah 51:27 · Berean Standard Bible

“Raise a banner in the land! Blow the ram’s horn among the nations! Prepare the nations against her. Summon the kingdoms against her— Ararat, Minni, and Ashkenaz. Appoint a captain against her; bring up horses like swarming locusts.

Context

25“Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe, gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m esetipụ aka m megide gị, kwapụ gị site na nkume dị elu. Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ. 26A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ, maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla, nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 27“Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ. Fụọnụ opi ike nʼetiti mba niile. Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ya; kpọkuonụ alaeze ndị a niile imegide ya: Ararat, na Mini, na Ashkenaz. Họpụtanụ ọchịagha ga-edu usuu ndị agha megide ya; ziganụ ịnyịnya ga-adị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka igurube. 28Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha, kwadoonụ ndị eze Midia, na ndị ha na-achị achị, na ndịisi ọchịchị, na mba niile nke ha na-achị. 29Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu, nʼihi na nzube Onyenwe anyị zubere megide Babilọn ga-emezu. Ọ ga-eme ka ala Babilọn ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.