Native Bible

Jeremiah 51:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe, gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m esetipụ aka m megide gị, kwapụ gị site na nkume dị elu. Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ.

Jeremiah 51:25 in English

Jeremiah 51:25 · Berean Standard Bible

“Behold, I am against you, O destroying mountain, you who devastate the whole earth, declares the LORD. I will stretch out My hand against you; I will roll you over the cliffs and turn you into a charred mountain.

Context

23gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya, gị ka m ga-eji tipịa onye ọrụ ubi na ehi ya; gị ka m ga-ejikwa tipịa ndị na-achị achị na ndịisi ọchịchị eze. 24“Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri. 25“Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe, gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m esetipụ aka m megide gị, kwapụ gị site na nkume dị elu. Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ. 26A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ, maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla, nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 27“Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ. Fụọnụ opi ike nʼetiti mba niile. Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ya; kpọkuonụ alaeze ndị a niile imegide ya: Ararat, na Mini, na Ashkenaz. Họpụtanụ ọchịagha ga-edu usuu ndị agha megide ya; ziganụ ịnyịnya ga-adị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka igurube.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.