Jeremaya 51:25
Jeremiah 51:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe, gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m esetipụ aka m megide gị, kwapụ gị site na nkume dị elu. Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ.
Jeremiah 51:25 in English
Jeremiah 51:25 · Berean Standard Bible
“Behold, I am against you, O destroying mountain, you who devastate the whole earth, declares the LORD. I will stretch out My hand against you; I will roll you over the cliffs and turn you into a charred mountain.
Context
23gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya,
gị ka m ga-eji tipịa onye ọrụ ubi na ehi ya;
gị ka m ga-ejikwa tipịa ndị na-achị achị na ndịisi ọchịchị eze. 24“Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri. 25“Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe,
gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Aga m esetipụ aka m megide gị,
kwapụ gị site na nkume dị elu.
Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ. 26A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ,
maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla,
nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 27“Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ.
Fụọnụ opi ike nʼetiti mba niile.
Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ya;
kpọkuonụ alaeze ndị a niile imegide ya:
Ararat, na Mini, na Ashkenaz.
Họpụtanụ ọchịagha ga-edu usuu ndị agha megide ya;
ziganụ ịnyịnya ga-adị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka igurube.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.