Jeremaya 51:24
Jeremiah 51:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.
Jeremiah 51:24 in English
Jeremiah 51:24 · Berean Standard Bible
Before your very eyes I will repay Babylon and all the dwellers of Chaldea * for all the evil they have done in Zion,” declares the LORD.
Context
22gị ka m ga-eji tipịa nwoke na nwanyị,
gị ka m ga-eji tipịa agadi nwoke na okorobịa,
gị ka m ga-eji tipịa okorobịa na nwaagbọghọ, 23gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya,
gị ka m ga-eji tipịa onye ọrụ ubi na ehi ya;
gị ka m ga-ejikwa tipịa ndị na-achị achị na ndịisi ọchịchị eze. 24“Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri. 25“Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe,
gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Aga m esetipụ aka m megide gị,
kwapụ gị site na nkume dị elu.
Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ. 26A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ,
maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla,
nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.