Native Bible

Jeremiah 51:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya, gị ka m ga-eji tipịa onye ọrụ ubi na ehi ya; gị ka m ga-ejikwa tipịa ndị na-achị achị na ndịisi ọchịchị eze.

Jeremiah 51:23 in English

Jeremiah 51:23 · Berean Standard Bible

With you I shatter the shepherd and his flock; with you I shatter the farmer and his oxen; with you I shatter the governors and officials.

Context

21gị ka m ga-eji tipịa ịnyịnya na onye na-agba ya, gị ka m ga-eji tipịa ụgbọ agha na onye na-anya ya; 22gị ka m ga-eji tipịa nwoke na nwanyị, gị ka m ga-eji tipịa agadi nwoke na okorobịa, gị ka m ga-eji tipịa okorobịa na nwaagbọghọ, 23gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya, gị ka m ga-eji tipịa onye ọrụ ubi na ehi ya; gị ka m ga-ejikwa tipịa ndị na-achị achị na ndịisi ọchịchị eze. 24“Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri. 25“Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe, gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m esetipụ aka m megide gị, kwapụ gị site na nkume dị elu. Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.