Jeremaya 51:26
Jeremiah 51:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ, maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla, nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Jeremiah 51:26 in English
Jeremiah 51:26 · Berean Standard Bible
No one shall retrieve from you a cornerstone or a foundation stone, because you will become desolate forever,” declares the LORD.
Context
24“Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri. 25“Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe,
gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Aga m esetipụ aka m megide gị,
kwapụ gị site na nkume dị elu.
Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ. 26A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ,
maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla,
nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 27“Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ.
Fụọnụ opi ike nʼetiti mba niile.
Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ya;
kpọkuonụ alaeze ndị a niile imegide ya:
Ararat, na Mini, na Ashkenaz.
Họpụtanụ ọchịagha ga-edu usuu ndị agha megide ya;
ziganụ ịnyịnya ga-adị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka igurube. 28Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha,
kwadoonụ ndị eze Midia,
na ndị ha na-achị achị, na ndịisi ọchịchị,
na mba niile nke ha na-achị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.