Jeremaya 51:30
Jeremiah 51:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ; ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike. Ike agwụla ha; ha adịla ka ndị inyom. E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ, tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile.
Jeremiah 51:30 in English
Jeremiah 51:30 · Berean Standard Bible
The warriors of Babylon have stopped fighting; they sit in their strongholds. Their strength is exhausted; they have become like women. Babylon’s homes have been set ablaze, the bars of her gates are broken.
Context
28Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha,
kwadoonụ ndị eze Midia,
na ndị ha na-achị achị, na ndịisi ọchịchị,
na mba niile nke ha na-achị. 29Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu,
nʼihi na nzube Onyenwe anyị zubere megide Babilọn ga-emezu.
Ọ ga-eme ka ala Babilọn ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya. 30Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ;
ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike.
Ike agwụla ha;
ha adịla ka ndị inyom.
E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ,
tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile. 31Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya,
otu onyeozi na-esochikwa onyeozi ọzọ nʼazụ;
ha niile na-abịa izi eze Babilọn ozi sị ya
na a dọtala obodo ya nʼagha, 32na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi,
na e sunyela ala mmiri mmiri niile ọkụ,
na ndị agha niile na-amakwa jijiji.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.