Jeremaya 51:32
Jeremiah 51:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi, na e sunyela ala mmiri mmiri niile ọkụ, na ndị agha niile na-amakwa jijiji.”
Jeremiah 51:32 in English
Jeremiah 51:32 · Berean Standard Bible
The fords have been seized, the marshes set on fire, and the soldiers are terrified.”
Context
30Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ;
ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike.
Ike agwụla ha;
ha adịla ka ndị inyom.
E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ,
tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile. 31Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya,
otu onyeozi na-esochikwa onyeozi ọzọ nʼazụ;
ha niile na-abịa izi eze Babilọn ozi sị ya
na a dọtala obodo ya nʼagha, 32na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi,
na e sunyela ala mmiri mmiri niile ọkụ,
na ndị agha niile na-amakwa jijiji.” 33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,
“Ada Babilọn dịka ebe ịzọcha ọka,
nʼoge a na-azọcha ya.
Mgbe a ga-ewe ya dịka e si ewe ihe ubi na-abịa nso.” 34“Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị,
o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya.
O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya.
O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ,
jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya.
Emesịa, ọ gbọpụtara anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.