Jeremaya 51:34
Jeremiah 51:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị, o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya. O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya. O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ, jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya. Emesịa, ọ gbọpụtara anyị.
Jeremiah 51:34 in English
Jeremiah 51:34 · Berean Standard Bible
“Nebuchadnezzar king of Babylon has devoured me; he has crushed me. He has set me aside like an empty vessel; he has swallowed me like a monster; he filled his belly with my delicacies and vomited me out.*
Context
32na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi,
na e sunyela ala mmiri mmiri niile ọkụ,
na ndị agha niile na-amakwa jijiji.” 33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,
“Ada Babilọn dịka ebe ịzọcha ọka,
nʼoge a na-azọcha ya.
Mgbe a ga-ewe ya dịka e si ewe ihe ubi na-abịa nso.” 34“Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị,
o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya.
O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya.
O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ,
jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya.
Emesịa, ọ gbọpụtara anyị. 35Ka ihe ike ahụ niile o mere anyị na ụmụ anyị dịkwasịkwa Babilọn nʼisi.”
Ọ bụ ihe ndị bi na Zayọn kwuru.
Jerusalem na-ekwukwa sị,
“Ka ọbara anyị dịkwa nʼisi ndị bi na Babilọn.” 36Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Lee, aga m ekwuchitere gị ọnụ gị,
bọtakwara gị ọbọ.
Aga m emekwa ka osimiri taa,
meekwa ka isi iyi mmiri niile taakwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.