Jeremaya 51:36
Jeremiah 51:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Lee, aga m ekwuchitere gị ọnụ gị, bọtakwara gị ọbọ. Aga m emekwa ka osimiri taa, meekwa ka isi iyi mmiri niile taakwa.
Jeremiah 51:36 in English
Jeremiah 51:36 · Berean Standard Bible
Therefore this is what the LORD says: “Behold, I will plead your case and take vengeance on your behalf; I will dry up her sea and make her springs run dry.
Context
34“Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị,
o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya.
O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya.
O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ,
jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya.
Emesịa, ọ gbọpụtara anyị. 35Ka ihe ike ahụ niile o mere anyị na ụmụ anyị dịkwasịkwa Babilọn nʼisi.”
Ọ bụ ihe ndị bi na Zayọn kwuru.
Jerusalem na-ekwukwa sị,
“Ka ọbara anyị dịkwa nʼisi ndị bi na Babilọn.” 36Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Lee, aga m ekwuchitere gị ọnụ gị,
bọtakwara gị ọbọ.
Aga m emekwa ka osimiri taa,
meekwa ka isi iyi mmiri niile taakwa. 37Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe,
ọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa,
bụrụkwa ihe iju anya, na ihe nkọcha,
na ebe mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa. 38Ndị ya niile na-agbọ ụja dịka ụmụ ọdụm,
ha na-emekwa ụzụ dịka ụmụ ọdụm na-aṅụ ara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.