Jeremaya 51:38
Jeremiah 51:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ya niile na-agbọ ụja dịka ụmụ ọdụm, ha na-emekwa ụzụ dịka ụmụ ọdụm na-aṅụ ara.
Jeremiah 51:38 in English
Jeremiah 51:38 · Berean Standard Bible
They will roar together like young lions; they will growl like lion cubs.
Context
36Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Lee, aga m ekwuchitere gị ọnụ gị,
bọtakwara gị ọbọ.
Aga m emekwa ka osimiri taa,
meekwa ka isi iyi mmiri niile taakwa. 37Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe,
ọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa,
bụrụkwa ihe iju anya, na ihe nkọcha,
na ebe mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa. 38Ndị ya niile na-agbọ ụja dịka ụmụ ọdụm,
ha na-emekwa ụzụ dịka ụmụ ọdụm na-aṅụ ara. 39Ma nʼoge ahụ a kpaliri ha,
aga m edo oriri nʼihu ha.
Aga m eme ka ha ṅụbiga mmanya oke,
si otu a mee ka ha jiri oke ịchị ọchị tie mkpu ọṅụ.
Nʼikpeazụ, ha ga-arahụ ụra ebighị ebi, nke ha na-agaghị esite na ya bilie.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 40“Aga m akpụdata ha,
dịka ụmụ atụrụ a na-aga igbu egbu,
dịka ebule na mkpi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.