Jeremaya 51:37
Jeremiah 51:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, ọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa, bụrụkwa ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ebe mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa.
Jeremiah 51:37 in English
Jeremiah 51:37 · Berean Standard Bible
Babylon will become a heap of rubble, a haunt for jackals,* an object of horror and scorn, without inhabitant.
Context
35Ka ihe ike ahụ niile o mere anyị na ụmụ anyị dịkwasịkwa Babilọn nʼisi.”
Ọ bụ ihe ndị bi na Zayọn kwuru.
Jerusalem na-ekwukwa sị,
“Ka ọbara anyị dịkwa nʼisi ndị bi na Babilọn.” 36Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Lee, aga m ekwuchitere gị ọnụ gị,
bọtakwara gị ọbọ.
Aga m emekwa ka osimiri taa,
meekwa ka isi iyi mmiri niile taakwa. 37Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe,
ọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa,
bụrụkwa ihe iju anya, na ihe nkọcha,
na ebe mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa. 38Ndị ya niile na-agbọ ụja dịka ụmụ ọdụm,
ha na-emekwa ụzụ dịka ụmụ ọdụm na-aṅụ ara. 39Ma nʼoge ahụ a kpaliri ha,
aga m edo oriri nʼihu ha.
Aga m eme ka ha ṅụbiga mmanya oke,
si otu a mee ka ha jiri oke ịchị ọchị tie mkpu ọṅụ.
Nʼikpeazụ, ha ga-arahụ ụra ebighị ebi, nke ha na-agaghị esite na ya bilie.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.